Psalms 128

Abụ nrigo.

Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

1Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;
ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv
gburugburu tebul gị.
4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ
na-atụ egwu Onyenwe anyị.

5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn
ụbọchị niile nke ndụ gị;
ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.
Ka udo dịrị Izrel. a
Copyright information for IboBIU